Isaiah 21

Amụma e buru banyere Babilọn

1Amụma megide ọzara nke dị nʼakụkụ oke osimiri:

Dịka oke ifufe si nʼọzara Negeb na-efebiga,
ka onye na-eme ihe ike ga-esi nʼọzara bịa,
site nʼala nke oke egwu.

2Ahụrụ m ọhụ dị egwu, ọhụ oke mbibi,
na ọhụ oke nrara nye nʼaka ndị mbibi, nʼebe onye na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-akwakọta ngwongwo.
Bilienụ unu ndị agha Elam, buonu agha! Unu ndị agha Midia, gbaanụ obodo gburugburu!
Aga m eme ka ịsụ ude na mmegbu niile kwụsị.

3Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu,
oke ihe mgbu
Ya bụ, ahụ ụfụ
zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme.
Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ,
ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya.
4Obi m anọkwaghị jụụ,
oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu;
chi ojiji nke m na-ele anya ya
aghọọlara m ihe ịma jijiji.

5Ha na-akwado tebul.
Ha na-edozi ute ịnọdụ ala,
ha na-eri, ha na-aṅụ.
Bilienụ ndịisi agha,
teekwanụ ọta niile mmanụ!
6Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m,

“Gaa, guzobe onye nche,
ka o kwuo ihe ọ na-ahụ.
7Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha,
na usuu ịnyịnya,
na ndị na-agba ịnyịnya ibu,
maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ,
gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma,
nọọkwa na njikere.”
8Onye nche na-elepụ anya tiri mkpu dịka ọdụm, sị,

“Onyenwe m, nʼehihie ụbọchị niile ka m na-eguzo nʼelu ụlọ nche,
nʼọnọdụ nche m ka m na-eguzokwa abalị niile.
9Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa,
ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ.
O nyeghachiri ọsịsa ahụ,
‘Babilọn adaala, e ọ daala,
arụsị niile apịrị apị nke chi ya niile
a kurisiela tọgbọrọ nʼala.’ ”

10O, ndị m, ndị a zọchara azọcha, dịka ọka a zọchara nʼebe ịzọcha ọka,
agwala m unu ihe
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
bụ Chineke Izrel kwuru.

Amụma banyere Edọm

11Nke a bụ amụma megide Duma:

Otu onye si na Sia na-akpọ m oku,
“Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?
Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?”
12Onye nche zara sị,
“Chi ọbụbọ na-abịa, abalị na-abịakwa.
Ọ bụrụ na ị chọrọ ịjụ ajụjụ, jụọnụ ajụjụ,
ma laghachikwa ọzọ.”

Amụma e buru banyere Arebịa

13Amụma megide Arebịa:

Unu ndị ije niile nke Dedan,
ndị na-anọ ọnọdụ abalị nʼoke ọhịa nke Arebịa,
14kuterenụ ndị ahụ bịakwutere unu akpịrị na-akpọ nkụ mmiri ọṅụṅụ;
unu ndị bi nʼala Tema,
buterenụ ndị gbakwutere unu ọsọ ndụ nri.
15Nʼihi na ọ bụ site nʼagha
nke e ji mma agha egbu ndị mmadụ,
na agha e ji akụ agbatu mmadụ
ka ha si na-agbapụ ọsọ.
16Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị m, “Tupu otu afọ agwụ, dị ka esi agụ afọ onye ohu e goro ọrụ, ịma mma Keda ga-agwụsị. 17Ndị fọdụrụ ndụ nʼime ndị na-agba ụta, ndị bụ dike nʼagha na Keda, ga-adị mmadụ ole na ole.” Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel ekwuola ya.

Copyright information for IboBIU